Dashịbọọdụ Nsụgharị Akwụkwọ Nsọ
Site na dashịbọọdụ nke nsụgharị Baịbụl, ị gà-ènwé ike ịhụ data dị na nsụgharị Baịbụl ọdịyo na ederede gị. Nghọta-Ime Gasị ndị a nà-ènyé gị ohere ịhụ data achịkọtarà ọnụ ma hụ ka Obodo YouVersion sì etinye aka na Akwụkwọ Nsọ.

Dị Mkpa: Data egosìrì maka Nghọta-Ime Gasị abụghị laiv ma ọbụ̀ nke oge ugbu ugbu a. Enwerè igbu oge ụbọchị abụọ.
Otù Esi Ayocha Data Gị:
- Họrọ nsụgharị ịchọrọ ịhụ data ya n'okpuru Nsụgharị Niile.
- Họrọ oge ịchọrọ ịlelè data ahụ na (Oge Niile, Ụbọchị 7 gara aga, Ụbọchị 28 gara aga, Ụbọchị 90 gara aga, ma ọbụ̀ Ọnwa 12 gara aga).
- Họrọ Ederede ma ọ bụ̀ Ọdịyo.
- Họrọ Tụlee site na Nsụgharị ma ọbụ̀ Tụlee site na Obodo.
Ihe Omume Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe:
Lelee data gị gbàsará mkpokọta ihe omume ndị n'eji ngwá èmé ihe, ihe omume ndị ọhụrụ n'eji ngwá èmé ihe, na nnọgide ndị n'eji ngwá èmé ihe.
- Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe N'ụzọ Ahụrụ Anya - ọnụọgụgụ ndị tinyere aka opekata mpe otu ugboro n'oge ahọpụtarà.
- Ndị Ọhụrụ N'eji Ngwá Èmé Ihe - ọnụọgụgụ ndị tinyere aka nke mbụ n'oge ahọpụtarà.
- Nnọgide Ndị N'eji Ngwá Èmé Ihe - ọnụọgụgụ ndị tínyéré aka n'ọnwa ahọpụtarà, bụ́ ndị a chọpụtakwarà na ha tinyerè aka n'ọnwa gara aga.Dị̀ adị́ naanị mgbe ana èmé nlelè site n'ọnwa.
Họrọ Ụdị Nsụgharị Niile dị n'akụkụ aka nri ala iji hụ ụdị nsụgharị Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ.

Ntinye Aka:
Lelee otù Obodo YouVersion sì emekọrịta ihe na nsụgharị-gasị Akwụkwọ Nsọ gị site na ihe ndị emerè ka ha pụta ìhè, nkekọrịta amaokwu gasị, nbudata gasị emerè na offlaịnụ, na arịrịọ gasị maka isi-akwụkwọ.

Ọ̀ dị̀ gị mkpa ibupụ data nsụgharị Akwụkwọ Nsọ gị? Gaa na Bupụ Data Onye Mbipụta Akwụkwọ Nsọ ka ịmụta otù e si èmé ya.